Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Devid nụrụ ihe Sọl na-achọ ime, ọ gwara Abịata onye nchụaja sị ya, “Chịta efọọd ahụ.”*

1 Samuel 23:9 in English

1 Samuel 23:9 · Berean Standard Bible

When David learned that Saul was plotting evil against him, he said to Abiathar the priest, “Bring the ephod.”

Context

7Mgbe a gwara Sọl na Devid nọ na Keila, o kwuru sị, “Ahaa! Chineke enyefeela ya nʼaka m, nʼihi na Devid e jirila aka ya kee onwe ya agbụ site nʼịbanye nʼobodo nwere ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ha.” 8Sọl chịkọtara ndị agha ya ịga Keila ịnọchibido Devid na ndị ikom ya. 9Mgbe Devid nụrụ ihe Sọl na-achọ ime, ọ gwara Abịata onye nchụaja sị ya, “Chịta efọọd ahụ.”* 10Devid sịrị, “O! Onyenwe anyị, Chineke Izrel, anụla m na Sọl na-achọ ịbịa laa Keila na obodo a nʼiyi nʼihi m nọ nʼebe a. 11Ndị nwe Keila ha ga-arara m nye nʼaka Sọl? Ọ bụ ezie na Sọl na-abịa dịka m nụrụ? O! Onyenwe anyị, Chineke Izrel, biko gwa ohu gị.” Ma Onyenwe anyị sịrị, “Ọ ga-abịa.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.