Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Sọl chịkọtara ndị agha ya ịga Keila ịnọchibido Devid na ndị ikom ya.

1 Samuel 23:8 in English

1 Samuel 23:8 · Berean Standard Bible

Then Saul summoned all his troops to go to war at Keilah and besiege David and his men.

Context

6(Ugbu a, Abịata nwa Ahimelek chịkwa efọọd nʼaka gbadaa, mgbe ọ gbakwujere Devid na Keila). 7Mgbe a gwara Sọl na Devid nọ na Keila, o kwuru sị, “Ahaa! Chineke enyefeela ya nʼaka m, nʼihi na Devid e jirila aka ya kee onwe ya agbụ site nʼịbanye nʼobodo nwere ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ha.” 8Sọl chịkọtara ndị agha ya ịga Keila ịnọchibido Devid na ndị ikom ya. 9Mgbe Devid nụrụ ihe Sọl na-achọ ime, ọ gwara Abịata onye nchụaja sị ya, “Chịta efọọd ahụ.”* 10Devid sịrị, “O! Onyenwe anyị, Chineke Izrel, anụla m na Sọl na-achọ ịbịa laa Keila na obodo a nʼiyi nʼihi m nọ nʼebe a.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.