1 Samuel 23:6
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
(Ugbu a, Abịata nwa Ahimelek chịkwa efọọd nʼaka gbadaa, mgbe ọ gbakwujere Devid na Keila).
1 Samuel 23:6 in English
1 Samuel 23:6 · Berean Standard Bible
(Now Abiathar son of Ahimelech had brought the ephod with him when he fled to David at Keilah.)
Context
4Devid jụrụ Onyenwe anyị ọzọ, ma Onyenwe anyị zara ya nke ugboro abụọ sị, “Jee, rịdaruo Keila, nʼihi na aga m anọnyere gị; ị ga-emerikwa ndị Filistia.” 5Ya mere, Devid na ndị agha ya gara Keila buso ndị Filistia agha. Ndị agha Devid gburu ọtụtụ ndị Filistia kpokọrọ igwe anụ ụlọ ha. Ha zọpụtakwara ndị Keila. 6(Ugbu a, Abịata nwa Ahimelek chịkwa efọọd nʼaka gbadaa, mgbe ọ gbakwujere Devid na Keila). 7Mgbe a gwara Sọl na Devid nọ na Keila, o kwuru sị, “Ahaa! Chineke enyefeela ya nʼaka m, nʼihi na Devid e jirila aka ya kee onwe ya agbụ site nʼịbanye nʼobodo nwere ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ha.” 8Sọl chịkọtara ndị agha ya ịga Keila ịnọchibido Devid na ndị ikom ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.