1 Samuel 23:14
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼoge a, Devid nọgidere nʼebe e wusiri ike dị nʼọzara, na nʼala ugwu ugwu nke ọzara Zif. Ụbọchị niile, Sọl chọgharịrị ya ma Chineke enyefeghị Devid nʼaka ya.
1 Samuel 23:14 in English
1 Samuel 23:14 · Berean Standard Bible
And David stayed in the wilderness strongholds and in the hill country of the Wilderness of Ziph. Day after day Saul searched for him, but God would not deliver David into his hand.
Context
12Ọzọkwa, Devid jụrụ sị, “Ndị nwe Keila ha ga-arara m na ndị ikom m nye nʼaka Sọl?”
Onyenwe anyị sịrị, “Ha ga-eme otu a.” 13Nʼihi ya, Devid na ndị ikom ya ọnụọgụgụ ha dị narị ndị ikom isii, hapụrụ Keila pụọ na-awagharị site nʼotu ebe gaa nʼebe ọzọ. Mgbe Sọl nụrụ na Devid esitela na Keila pụọ, o jekwaghị ebe ahụ ọzọ. 14Nʼoge a, Devid nọgidere nʼebe e wusiri ike dị nʼọzara, na nʼala ugwu ugwu nke ọzara Zif. Ụbọchị niile, Sọl chọgharịrị ya ma Chineke enyefeghị Devid nʼaka ya. 15Mgbe Devid nọ na Horesh, nke dị nʼọzara Zif, ọ natara ozi na Sọl na-abịa igbu ya. 16Jonatan, nwa Sọl pụrụ ịchọ Devid. Mgbe ọ hụrụ ya na Horesh, ọ gbara ya ume, nyere ya aka iguzosi ike nʼime Chineke.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.