1 Samuel 23:13
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya, Devid na ndị ikom ya ọnụọgụgụ ha dị narị ndị ikom isii, hapụrụ Keila pụọ na-awagharị site nʼotu ebe gaa nʼebe ọzọ. Mgbe Sọl nụrụ na Devid esitela na Keila pụọ, o jekwaghị ebe ahụ ọzọ.
1 Samuel 23:13 in English
1 Samuel 23:13 · Berean Standard Bible
Then David and his men, about six hundred strong, set out and departed from Keilah, moving from place to place. When Saul was told that David had escaped from Keilah, he declined to go forth.
Context
11Ndị nwe Keila ha ga-arara m nye nʼaka Sọl? Ọ bụ ezie na Sọl na-abịa dịka m nụrụ? O! Onyenwe anyị, Chineke Izrel, biko gwa ohu gị.”
Ma Onyenwe anyị sịrị, “Ọ ga-abịa.” 12Ọzọkwa, Devid jụrụ sị, “Ndị nwe Keila ha ga-arara m na ndị ikom m nye nʼaka Sọl?”
Onyenwe anyị sịrị, “Ha ga-eme otu a.” 13Nʼihi ya, Devid na ndị ikom ya ọnụọgụgụ ha dị narị ndị ikom isii, hapụrụ Keila pụọ na-awagharị site nʼotu ebe gaa nʼebe ọzọ. Mgbe Sọl nụrụ na Devid esitela na Keila pụọ, o jekwaghị ebe ahụ ọzọ. 14Nʼoge a, Devid nọgidere nʼebe e wusiri ike dị nʼọzara, na nʼala ugwu ugwu nke ọzara Zif. Ụbọchị niile, Sọl chọgharịrị ya ma Chineke enyefeghị Devid nʼaka ya. 15Mgbe Devid nọ na Horesh, nke dị nʼọzara Zif, ọ natara ozi na Sọl na-abịa igbu ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.