Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma eze kwuru sị, “Ị ga-anwụ. Ahimelek gị na ezinaụlọ nna gị niile!”

1 Samuel 22:16 in English

1 Samuel 22:16 · Berean Standard Bible

But the king replied, “You will surely die, Ahimelech, you and all your father’s house!”

Context

14Ahimelek zara eze sị, “Onye nʼetiti ndị ohu gị niile bụ onye kwesiri ntụkwasị obi dịka Devid, ọgọ eze, na onyeisi ndị agha na-eche gị nche; ọ bụkwa onye a na-enye nsọpụrụ dị ukwuu nʼezinaụlọ gị? 15Nke a ọ bụ ụbọchị mbụ m na-ajụrụ ya ase nʼaka Chineke? Ọ bụghị! Ka eze ghara ibo ohu ya na ezinaụlọ nna m ebubo, nʼihi na ohu gị amaghị ihe ọbụla banyere okwu a niile.” 16Ma eze kwuru sị, “Ị ga-anwụ. Ahimelek gị na ezinaụlọ nna gị niile!” 17O nyere ndị na-eso ya iwu sị ha, “Gbuonụ ndị nchụaja ndị a, nʼihi na ha na Devid agbaala izuzu; ha makwa na o si nʼihu m na-agbapụ, ma ha agwaghị m!” Ma ndị agha eze jụrụ isetipụ aka ha megide ndị nchụaja Onyenwe anyị. 18Mgbe ahụ eze nyere Doeg iwu sị ya, “Gị onwe gị, chigharịa gbuo ha.” Ya mere, Doeg onye Edọm chigharịrị tigbuo ha. Nʼụbọchị ahụ, o gburu iri ndị nchụaja asatọ na ise, ndị yi uwe akwa ọcha efọọd.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.