1 Samuel 22:14
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ahimelek zara eze sị, “Onye nʼetiti ndị ohu gị niile bụ onye kwesiri ntụkwasị obi dịka Devid, ọgọ eze, na onyeisi ndị agha na-eche gị nche; ọ bụkwa onye a na-enye nsọpụrụ dị ukwuu nʼezinaụlọ gị?
1 Samuel 22:14 in English
1 Samuel 22:14 · Berean Standard Bible
Ahimelech answered the king, “Who among all your servants is as faithful as David, the king’s son-in-law, the captain of your bodyguard who is honored in your house?
Context
12Sọl gwara ha okwu sị, “Gee ntị, gị nwa Ahitub.”
Ahimelek zara sị, “Ana m ege ntị, onyenwe m.” 13Sọl jụrụ ya sị, “Gịnị mere gị na nwa Jesi ji gbaa izu imegide m? Gịnị mere i ji nye ya nri na mma agha, jụkwaara ya ase site nʼaka Chineke? Gịnị mere i ji na-agba ya ume ka o nupu isi nʼebe m nọ, na ka ọ bịakwa nʼebe a imegide m taa?” 14Ahimelek zara eze sị, “Onye nʼetiti ndị ohu gị niile bụ onye kwesiri ntụkwasị obi dịka Devid, ọgọ eze, na onyeisi ndị agha na-eche gị nche; ọ bụkwa onye a na-enye nsọpụrụ dị ukwuu nʼezinaụlọ gị? 15Nke a ọ bụ ụbọchị mbụ m na-ajụrụ ya ase nʼaka Chineke? Ọ bụghị! Ka eze ghara ibo ohu ya na ezinaụlọ nna m ebubo, nʼihi na ohu gị amaghị ihe ọbụla banyere okwu a niile.” 16Ma eze kwuru sị, “Ị ga-anwụ. Ahimelek gị na ezinaụlọ nna gị niile!”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.