1 Samuel 2:26
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nwata ahụ bụ Samuel na-eto, na-agba dimkpa, bụrụkwa onye ihe ya dị Onyenwe anyị na mmadụ mma.
1 Samuel 2:26 in English
1 Samuel 2:26 · Berean Standard Bible
And the boy Samuel continued to grow in stature and in favor with the LORD and with man.
Context
24Ọ bụghị akụkọ ọma ka m na-anụ site nʼọnụ ndị Onyenwe anyị banyere unu. 25Ọ bụrụ na mmadụ emehie megide mmadụ, Chineke nwere ike gbooro ya ọgụ. Ma ọ bụrụ na mmadụ emehie megide Onyenwe anyị, onye ga-egboro ya ọgụ?” Ma ụmụ ya ndị ikom egeghị nna ha ntị, nʼihi na Onyenwe anyị na-akwado ịla ha nʼiyi. 26Nwata ahụ bụ Samuel na-eto, na-agba dimkpa, bụrụkwa onye ihe ya dị Onyenwe anyị na mmadụ mma. 27Otu onye nke Chineke bịara gwa Elayị okwu sị ya, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Ọ bụ na m ezipụtaghị ike m nʼụzọ pụtara ihe mgbe nna nna gị ha bụ ohu nʼala Ijipt nʼokpuru Fero? 28Ahọpụtara m nna nna unu ochie site nʼetiti ebo niile nke Izrel mee ya ka ọ bụrụ onye nchụaja m, ka ọ chụọ aja nʼebe ịchụ aja m, isure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na iyi uwe efọọd ndị nchụaja nʼihu m. Enyere m ezinaụlọ nna nna gị onyinye niile Izrel ji chụọ aja nsure ọkụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.