Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu onye nke Chineke bịara gwa Elayị okwu sị ya, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Ọ bụ na m ezipụtaghị ike m nʼụzọ pụtara ihe mgbe nna nna gị ha bụ ohu nʼala Ijipt nʼokpuru Fero?

1 Samuel 2:27 in English

1 Samuel 2:27 · Berean Standard Bible

Then a man of God came to Eli and told him, “This is what the LORD says: ‘Did I not clearly reveal Myself to your father’s house when they were in Egypt under Pharaoh’s house?

Context

25Ọ bụrụ na mmadụ emehie megide mmadụ, Chineke nwere ike gbooro ya ọgụ. Ma ọ bụrụ na mmadụ emehie megide Onyenwe anyị, onye ga-egboro ya ọgụ?” Ma ụmụ ya ndị ikom egeghị nna ha ntị, nʼihi na Onyenwe anyị na-akwado ịla ha nʼiyi. 26Nwata ahụ bụ Samuel na-eto, na-agba dimkpa, bụrụkwa onye ihe ya dị Onyenwe anyị na mmadụ mma. 27Otu onye nke Chineke bịara gwa Elayị okwu sị ya, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Ọ bụ na m ezipụtaghị ike m nʼụzọ pụtara ihe mgbe nna nna gị ha bụ ohu nʼala Ijipt nʼokpuru Fero? 28Ahọpụtara m nna nna unu ochie site nʼetiti ebo niile nke Izrel mee ya ka ọ bụrụ onye nchụaja m, ka ọ chụọ aja nʼebe ịchụ aja m, isure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na iyi uwe efọọd ndị nchụaja nʼihu m. Enyere m ezinaụlọ nna nna gị onyinye niile Izrel ji chụọ aja nsure ọkụ. 29Gịnị mere unu ji na-elelị aja a na-achụrụ m, na onyinye a na-ewetara m nʼusoro dịka m si nye ya nʼiwu anya? Gịnị mere i ji na-asọpụrụ ụmụ gị karịa m, ime onwe unu ka unu gbaa abụba site nʼidebere onwe unu akụkụ kachasị mma nke onyinye niile ụmụ Izrel, ndị m, na-ewetara m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.