Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Afọ ọbụla, nne ya na-akwara ya uwe mwụda, nke ọ na-ewetara ya mgbe ya na di ya bịara ịchụ aja.

1 Samuel 2:19 in English

1 Samuel 2:19 · Berean Standard Bible

Each year his mother would make him a little robe and bring it to him when she went with her husband to offer the annual sacrifice.

Context

17Mmehie ụmụ okorobịa ndị a na-eme dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị, nʼihi na ha na-eleda onyinye a na-ewetara Onyenwe anyị anya. 18Nʼoge a, Samuel na-agakwa ozi ya nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ ezie na ọ bụ naanị nwantakịrị, ọ na-eyi akwa ọcha efọọd dịka ndị nchụaja. 19Afọ ọbụla, nne ya na-akwara ya uwe mwụda, nke ọ na-ewetara ya mgbe ya na di ya bịara ịchụ aja. 20Tupu ha alaa, Elayị na-agọzi Elkena na Hana sị, “Ka Onyenwe anyị nye gị ụmụ ọzọ, ndị ga-anọchi anya onye a ị rịọrọ maka ya, nke i nyeghachiri Onyenwe anyị.” 21Onyenwe anyị gosiri Hana amara. Ọ tụrụ ime mụta ụmụ ndị ikom atọ, na ụmụ ndị inyom abụọ. Ma Samuel tokwara nʼije ozi ya nʼihu Onyenwe anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.