Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mmehie ụmụ okorobịa ndị a na-eme dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị, nʼihi na ha na-eleda onyinye a na-ewetara Onyenwe anyị anya.

1 Samuel 2:17 in English

1 Samuel 2:17 · Berean Standard Bible

Thus the sin of these young men was severe in the sight of the LORD, for they * were treating the LORD’s offering with contempt.

Context

15Mgbe ụfọdụ, tupu e suree abụba anụ nʼebe ịchụ aja,* ndị ozi onye nchụaja na-abịa gwa onye wetara anụ ịchụ aja sị ya, “Nye onye nchụaja anụ ndụ nke ọ ga-ahụ nʼọkụ, nʼihi na ọ chọghị iri anụ e siri esi, kama anụ ndụ ka ọ chọrọ.” 16Ọ bụrụ na onye ji anụ ahụ bịa ịchụ aja agwa onyeozi ahụ okwu sị, “Chere ka anyị buru ụzọ suo abụba ndị a ọkụ tupu i were ihe ị chọrọ,” onyeozi ahụ na-aza sị, “Nye m anụ ahụ ugbu a, ọ bụrụ na i nyeghị m ya aga m eji ike were ya.” 17Mmehie ụmụ okorobịa ndị a na-eme dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị, nʼihi na ha na-eleda onyinye a na-ewetara Onyenwe anyị anya. 18Nʼoge a, Samuel na-agakwa ozi ya nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ ezie na ọ bụ naanị nwantakịrị, ọ na-eyi akwa ọcha efọọd dịka ndị nchụaja. 19Afọ ọbụla, nne ya na-akwara ya uwe mwụda, nke ọ na-ewetara ya mgbe ya na di ya bịara ịchụ aja.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.