1 Samuel 2:18
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼoge a, Samuel na-agakwa ozi ya nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ ezie na ọ bụ naanị nwantakịrị, ọ na-eyi akwa ọcha efọọd dịka ndị nchụaja.
1 Samuel 2:18 in English
1 Samuel 2:18 · Berean Standard Bible
Now Samuel was ministering before the LORD—a boy wearing a linen ephod.
Context
16Ọ bụrụ na onye ji anụ ahụ bịa ịchụ aja agwa onyeozi ahụ okwu sị, “Chere ka anyị buru ụzọ suo abụba ndị a ọkụ tupu i were ihe ị chọrọ,” onyeozi ahụ na-aza sị, “Nye m anụ ahụ ugbu a, ọ bụrụ na i nyeghị m ya aga m eji ike were ya.” 17Mmehie ụmụ okorobịa ndị a na-eme dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị, nʼihi na ha na-eleda onyinye a na-ewetara Onyenwe anyị anya. 18Nʼoge a, Samuel na-agakwa ozi ya nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ ezie na ọ bụ naanị nwantakịrị, ọ na-eyi akwa ọcha efọọd dịka ndị nchụaja. 19Afọ ọbụla, nne ya na-akwara ya uwe mwụda, nke ọ na-ewetara ya mgbe ya na di ya bịara ịchụ aja. 20Tupu ha alaa, Elayị na-agọzi Elkena na Hana sị, “Ka Onyenwe anyị nye gị ụmụ ọzọ, ndị ga-anọchi anya onye a ị rịọrọ maka ya, nke i nyeghachiri Onyenwe anyị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.