Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nke a were Sọl iwe nke ukwuu. O kwuru nʼime onwe ya sị, “Gịnị bụ nke a? Ha enyela Devid ugwu dịka onye gburu iri puku kwụrụ puku ndị agha, ma mụ onwe m ka ha nyere naanị ugwu dịka onye gburu ọtụtụ puku ndị agha. Gịnị ọzọ fọdụrụ ya ugbu a, ma ọ bụghị naanị inweta alaeze?”

1 Samuel 18:8 in English

1 Samuel 18:8 · Berean Standard Bible

And Saul was furious and resented this song. “They have ascribed tens of thousands to David,” he said, “but only thousands to me. What more can he have but the kingdom?”

Context

6Mgbe ndị agha ahụ na-alọghachite, mgbe Devid gbusịrị onye Filistia* ahụ, ndị inyom* sitere nʼobodo niile nke Izrel pụta izute eze Sọl. Ha na-abụ abụ na-ete egwu ọṅụ, nke ha ji ụbọ akwara na ihe egwu ndị ọzọ na-eti. 7Dịka ha na-ete egwu, ha bụrụ abụ sị, “Sọl egbuola ọtụtụ puku ndị agha ma Devid egbuola iri puku kwụrụ puku ndị agha.” 8Nke a were Sọl iwe nke ukwuu. O kwuru nʼime onwe ya sị, “Gịnị bụ nke a? Ha enyela Devid ugwu dịka onye gburu iri puku kwụrụ puku ndị agha, ma mụ onwe m ka ha nyere naanị ugwu dịka onye gburu ọtụtụ puku ndị agha. Gịnị ọzọ fọdụrụ ya ugbu a, ma ọ bụghị naanị inweta alaeze?” 9Site nʼụbọchị ahụ gawa, Sọl malitere ile Devid anya ọjọọ. 10Nʼechi ya, mmụọ ọjọọ Chineke zitere bịara dakwasị Sọl, ọ malitekwara ibu amụma nʼụlọ ya. Ma Devid kpọrọ ụbọ akwara dịka ọ na-eme mgbe ọbụla. Ma nʼoge a, o nwere ùbe dị Sọl nʼaka.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.