1 Samuel 18:10
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼechi ya, mmụọ ọjọọ Chineke zitere bịara dakwasị Sọl, ọ malitekwara ibu amụma nʼụlọ ya. Ma Devid kpọrọ ụbọ akwara dịka ọ na-eme mgbe ọbụla. Ma nʼoge a, o nwere ùbe dị Sọl nʼaka.
1 Samuel 18:10 in English
1 Samuel 18:10 · Berean Standard Bible
The next day a spirit of distress * sent from God came upon Saul, and he prophesied inside the house while David played the harp as usual. Now Saul was holding a spear,
Context
8Nke a were Sọl iwe nke ukwuu. O kwuru nʼime onwe ya sị, “Gịnị bụ nke a? Ha enyela Devid ugwu dịka onye gburu iri puku kwụrụ puku ndị agha, ma mụ onwe m ka ha nyere naanị ugwu dịka onye gburu ọtụtụ puku ndị agha. Gịnị ọzọ fọdụrụ ya ugbu a, ma ọ bụghị naanị inweta alaeze?” 9Site nʼụbọchị ahụ gawa, Sọl malitere ile Devid anya ọjọọ. 10Nʼechi ya, mmụọ ọjọọ Chineke zitere bịara dakwasị Sọl, ọ malitekwara ibu amụma nʼụlọ ya. Ma Devid kpọrọ ụbọ akwara dịka ọ na-eme mgbe ọbụla. Ma nʼoge a, o nwere ùbe dị Sọl nʼaka. 11Ọ tụrụ ùbe ahụ, kwuo nʼobi ya sị, “Aga m atụgide Devid nʼaja ụlọ ahụ.” Ma Devid wezugara onwe ya, ugboro abụọ ndị a. 12Sọl na-atụ Devid egwu, nʼihi na Onyenwe anyị ahapụla Sọl, ma nọnyere Devid.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.