Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Sọl na-atụ Devid egwu, nʼihi na Onyenwe anyị ahapụla Sọl, ma nọnyere Devid.

1 Samuel 18:12 in English

1 Samuel 18:12 · Berean Standard Bible

So Saul was afraid of David, because the LORD was with David but had departed from Saul.

Context

10Nʼechi ya, mmụọ ọjọọ Chineke zitere bịara dakwasị Sọl, ọ malitekwara ibu amụma nʼụlọ ya. Ma Devid kpọrọ ụbọ akwara dịka ọ na-eme mgbe ọbụla. Ma nʼoge a, o nwere ùbe dị Sọl nʼaka. 11Ọ tụrụ ùbe ahụ, kwuo nʼobi ya sị, “Aga m atụgide Devid nʼaja ụlọ ahụ.” Ma Devid wezugara onwe ya, ugboro abụọ ndị a. 12Sọl na-atụ Devid egwu, nʼihi na Onyenwe anyị ahapụla Sọl, ma nọnyere Devid. 13Emesịa, Sọl mere ihe ga-eme ka ọ ghara ịhụkwa Devid anya ọzọ. O mere Devid ka ọ bụrụ onye na-elekọta puku ndị agha, ndị ọ na-edu na-aga ibu agha. 14Ma ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma, nʼihi na Onyenwe anyị na-anọnyere ya.*

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.