Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Dịka ha na-ete egwu, ha bụrụ abụ sị, “Sọl egbuola ọtụtụ puku ndị agha ma Devid egbuola iri puku kwụrụ puku ndị agha.”

1 Samuel 18:7 in English

1 Samuel 18:7 · Berean Standard Bible

And as the women danced, they sang out: “Saul has slain his thousands, and David his tens of thousands.”

Context

5Devid jeziri ozi niile Sọl ziri ya, o mere ihe niile nke ọma nke a mere na Sọl nyere ya ọkwa dị elu nʼetiti ndị agha ya. Ọnọdụ a dị mma nʼanya ndị Izrel nakwa nʼanya ndị agha Sọl. 6Mgbe ndị agha ahụ na-alọghachite, mgbe Devid gbusịrị onye Filistia* ahụ, ndị inyom* sitere nʼobodo niile nke Izrel pụta izute eze Sọl. Ha na-abụ abụ na-ete egwu ọṅụ, nke ha ji ụbọ akwara na ihe egwu ndị ọzọ na-eti. 7Dịka ha na-ete egwu, ha bụrụ abụ sị, “Sọl egbuola ọtụtụ puku ndị agha ma Devid egbuola iri puku kwụrụ puku ndị agha.” 8Nke a were Sọl iwe nke ukwuu. O kwuru nʼime onwe ya sị, “Gịnị bụ nke a? Ha enyela Devid ugwu dịka onye gburu iri puku kwụrụ puku ndị agha, ma mụ onwe m ka ha nyere naanị ugwu dịka onye gburu ọtụtụ puku ndị agha. Gịnị ọzọ fọdụrụ ya ugbu a, ma ọ bụghị naanị inweta alaeze?” 9Site nʼụbọchị ahụ gawa, Sọl malitere ile Devid anya ọjọọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.