1 Samuel 18:27
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Devid na ndị agha ya pụrụ gbuo narị ndị Filistia abụọ, werekwa apị ha gosi eze. Sọl kpọnyere Devid Mikal, nwa ya nwanyị, ka ọ bụrụ nwunye ya.
1 Samuel 18:27 in English
1 Samuel 18:27 · Berean Standard Bible
David and his men went out and killed two hundred Philistines. He brought their foreskins and presented them as payment in full to become the king’s son-in-law. Then Saul gave his daughter Michal to David in marriage.
Context
25ọ gwara ha sị, “Gwanụ Devid, ‘Eze achọghị ihe ọzọ dịka ụgwọ isi akụ ọbụla karịa naanị narị apị ndị Filistia. Ka ọ bụrụ ọbọ ọ ga-abọrọ m nʼisi ndị iro m.’ ” Ma ihe Sọl bu nʼobi bụ na a ga-egbu Devid nʼọgụ ahụ. 26Mgbe ndị ohu eze gwara Devid ihe eze kwuru, ọ tọrọ ya ụtọ, nʼihi ya, o kwenyere ịbụ ọgọ eze. Tupu oge ahụ a kara aka eruo, 27Devid na ndị agha ya pụrụ gbuo narị ndị Filistia abụọ, werekwa apị ha gosi eze. Sọl kpọnyere Devid Mikal, nwa ya nwanyị, ka ọ bụrụ nwunye ya. 28Mgbe Sọl hụrụ na Onyenwe anyị na-anọnyere Devid, hụkwa na Mikal nwa ya nwanyị hụrụ Devid nʼanya, 29ọ tụrụ Devid ụjọ karịa na mbụ. Sọl kpọkwara Devid asị, gụọ ya dịka onye iro ụbọchị ndụ ya niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.