Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ọ gwara ha sị, “Gwanụ Devid, ‘Eze achọghị ihe ọzọ dịka ụgwọ isi akụ ọbụla karịa naanị narị apị ndị Filistia. Ka ọ bụrụ ọbọ ọ ga-abọrọ m nʼisi ndị iro m.’ ” Ma ihe Sọl bu nʼobi bụ na a ga-egbu Devid nʼọgụ ahụ.

1 Samuel 18:25 in English

1 Samuel 18:25 · Berean Standard Bible

Saul replied, “Say to David, ‘The king desires no other dowry but a hundred Philistine foreskins as revenge on his enemies.’” But Saul intended to cause David’s death at the hands of the Philistines.

Context

23Ha gwara Devid okwu ndị a niile. Ma Devid zara sị, “Ọ bụ ihe nta ịbụ ọgọ eze? Mụ onwe m bụ onye ogbenye, onye a na-amaghị ama.” 24Mgbe ndị ohu Sọl gwara Sọl ihe Devid kwuru, 25ọ gwara ha sị, “Gwanụ Devid, ‘Eze achọghị ihe ọzọ dịka ụgwọ isi akụ ọbụla karịa naanị narị apị ndị Filistia. Ka ọ bụrụ ọbọ ọ ga-abọrọ m nʼisi ndị iro m.’ ” Ma ihe Sọl bu nʼobi bụ na a ga-egbu Devid nʼọgụ ahụ. 26Mgbe ndị ohu eze gwara Devid ihe eze kwuru, ọ tọrọ ya ụtọ, nʼihi ya, o kwenyere ịbụ ọgọ eze. Tupu oge ahụ a kara aka eruo, 27Devid na ndị agha ya pụrụ gbuo narị ndị Filistia abụọ, werekwa apị ha gosi eze. Sọl kpọnyere Devid Mikal, nwa ya nwanyị, ka ọ bụrụ nwunye ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.