Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha gwara Devid okwu ndị a niile. Ma Devid zara sị, “Ọ bụ ihe nta ịbụ ọgọ eze? Mụ onwe m bụ onye ogbenye, onye a na-amaghị ama.”

1 Samuel 18:23 in English

1 Samuel 18:23 · Berean Standard Bible

But when Saul’s servants relayed these words to David, he replied, “Does it seem trivial in your sight to be the son-in-law of the king? I am a poor man and lightly esteemed.”

Context

21O kwuru nʼobi ya sị, “Aga m akpọnye ya nwa m nwanyị, ka ọ bụrụ ihe ịma nʼọnya nye ya, ka aka ndị Filistia si otu a megide ya.” Ya mere, Sọl gwara Devid sị ya, “Ugbu a i nwekwara ohere ọzọ ịghọ ọgọ m nwoke.” 22Sọl nyere ndị ohu ya iwu sị, “Gwanụ Devid okwu na nzuzo sị ya, ‘Lee, ihe banyere gị masịrị eze, ndị niile na-ejere ya ozi hụkwara gị nʼanya. Ugbu a, kwerenụ ịbụ ọgọ ya.’ ” 23Ha gwara Devid okwu ndị a niile. Ma Devid zara sị, “Ọ bụ ihe nta ịbụ ọgọ eze? Mụ onwe m bụ onye ogbenye, onye a na-amaghị ama.” 24Mgbe ndị ohu Sọl gwara Sọl ihe Devid kwuru, 25ọ gwara ha sị, “Gwanụ Devid, ‘Eze achọghị ihe ọzọ dịka ụgwọ isi akụ ọbụla karịa naanị narị apị ndị Filistia. Ka ọ bụrụ ọbọ ọ ga-abọrọ m nʼisi ndị iro m.’ ” Ma ihe Sọl bu nʼobi bụ na a ga-egbu Devid nʼọgụ ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.