Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ụmụ ndị ikom Jesi asaa si otu a gafee nʼihu Samuel, ma Samuel sịrị ya, “Onyenwe anyị ahọrọghị ndị a.”

1 Samuel 16:10 in English

1 Samuel 16:10 · Berean Standard Bible

Thus Jesse made seven of his sons pass before Samuel, but Samuel told him, “The LORD has not chosen any of these.”

Context

8Jesi kpọrọ Abinadab ka ọ gafee nʼihu Samuel. Ma Samuel sịrị, “Onyenwe anyị ahọrọghị onye a.” 9Jesi mere ka Shama bịa gafee, ma Samuel sịrị, “Mba Onyenwe anyị ahọrọghị onye a.” 10Ụmụ ndị ikom Jesi asaa si otu a gafee nʼihu Samuel, ma Samuel sịrị ya, “Onyenwe anyị ahọrọghị ndị a.” 11Ọ jụrụ Jesi sị, “Ndị a ọ gwụchaala ụmụ ndị ikom ị mụtara?” Jesi zara sị “O fọdụrụ ọdụdụ nwa m, ma ọ nọ nʼọhịa na-azụ atụrụ.” Samuel sịrị, “Ziga ozi kpọlata ya, anyị agaghị anọdụ ala tutu ruo mgbe ọ bịara.” 12Ọ zigara ozi ka akpọọ ya, mee ka ọ bịa. O nwere ụcha ahụ pụrụ iche, nwee anya mara mma, dịkwa mma ile anya. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Samuel okwu sị ya, “Ọ bụ onye a, bilie tee ya mmanụ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.