Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jesi mere ka Shama bịa gafee, ma Samuel sịrị, “Mba Onyenwe anyị ahọrọghị onye a.”

1 Samuel 16:9 in English

1 Samuel 16:9 · Berean Standard Bible

Next Jesse presented Shammah,* but Samuel said, “The LORD has not chosen this one either.”

Context

7Ma Onyenwe anyị zara Samuel sị ya, “Ejila ihu mmadụ maọbụ ito ogologo ya ekpebi, nʼihi na onye a abụghị ya. Onyenwe anyị adịghị ahụ ihe dịka mmadụ si ahụ. Mmadụ na-ele anya nʼelu ahụ, ma Onyenwe anyị na-ele anya nʼobi.” 8Jesi kpọrọ Abinadab ka ọ gafee nʼihu Samuel. Ma Samuel sịrị, “Onyenwe anyị ahọrọghị onye a.” 9Jesi mere ka Shama bịa gafee, ma Samuel sịrị, “Mba Onyenwe anyị ahọrọghị onye a.” 10Ụmụ ndị ikom Jesi asaa si otu a gafee nʼihu Samuel, ma Samuel sịrị ya, “Onyenwe anyị ahọrọghị ndị a.” 11Ọ jụrụ Jesi sị, “Ndị a ọ gwụchaala ụmụ ndị ikom ị mụtara?” Jesi zara sị “O fọdụrụ ọdụdụ nwa m, ma ọ nọ nʼọhịa na-azụ atụrụ.” Samuel sịrị, “Ziga ozi kpọlata ya, anyị agaghị anọdụ ala tutu ruo mgbe ọ bịara.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.