1 Samuel 13:22
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke mere na ahụtaghị mma agha* maọbụ ùbe ọbụla nʼaka ndị agha Izrel nʼụbọchị agha ahụ, ma ọ bụghị naanị nke dị nʼaka Sọl na Jonatan.*
1 Samuel 13:22 in English
1 Samuel 13:22 · Berean Standard Bible
So on the day of battle not a sword or spear could be found in the hands of the troops with Saul and Jonathan; only Saul and his son Jonathan had weapons.
Context
20Izrel niile na-ejekwuru ndị Filistia maka ịmụ ọgụ igwuze ala ha, maọbụ mma oge ha, maọbụ anyụike ha, maọbụ mma ha ji ewe ihe ubi. 21Ihe ha na-akwụ maka ịmụ ọgụ igwuze ala, na mma oge ha bụ ụzọ abụọ nke shekel e kere ụzọ atọ, maka ịmụ anyụike, na ndụdụ, ya na ịpị ndụdụ e ji achị ehi bụ, otu ụzọ nke shekel e kere ụzọ atọ. 22Nke mere na ahụtaghị mma agha* maọbụ ùbe ọbụla nʼaka ndị agha Izrel nʼụbọchị agha ahụ, ma ọ bụghị naanị nke dị nʼaka Sọl na Jonatan.* 23Ugbu a ndị Filistia e kewapụtara iche a pụọla gaa nʼụzọ warawara dị na Mikmash.
13:1 Nʼụfọdụ akwụkwọ ndị ọgbara ọhụrụ e nweghị ọnụọgụgụ a
13:22 Nkp 5:8
13:22 Ọ bụ ụta na àkụ ka ndị Izrel ji lụọ ọgụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.