Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Izrel niile na-ejekwuru ndị Filistia maka ịmụ ọgụ igwuze ala ha, maọbụ mma oge ha, maọbụ anyụike ha, maọbụ mma ha ji ewe ihe ubi.

1 Samuel 13:20 in English

1 Samuel 13:20 · Berean Standard Bible

Instead, all the Israelites would go down to the Philistines to sharpen their plowshares, mattocks, axes, and sickles.*

Context

18nke ọzọ chere ihu ịga Bet-Horon, nke atọ chee ihu nʼụzọ oke ala dị na Ndagwurugwu Zeboiim, nke dị ọzara nso. 19Nʼoge ahụ, e nweghị ike ịchọta otu ọkpụ ụzụ nʼala Izrel, nʼihi na ndị Filistia sịrị, “Ma ọ bụghị otu a, ndị Hibru ga-akpụtara onwe ha mma agha maọbụ ùbe.” 20Izrel niile na-ejekwuru ndị Filistia maka ịmụ ọgụ igwuze ala ha, maọbụ mma oge ha, maọbụ anyụike ha, maọbụ mma ha ji ewe ihe ubi. 21Ihe ha na-akwụ maka ịmụ ọgụ igwuze ala, na mma oge ha bụ ụzọ abụọ nke shekel e kere ụzọ atọ, maka ịmụ anyụike, na ndụdụ, ya na ịpị ndụdụ e ji achị ehi bụ, otu ụzọ nke shekel e kere ụzọ atọ. 22Nke mere na ahụtaghị mma agha* maọbụ ùbe ọbụla nʼaka ndị agha Izrel nʼụbọchị agha ahụ, ma ọ bụghị naanị nke dị nʼaka Sọl na Jonatan.*

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.