Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, sị ya, ‘Anyị emehiela,* anyị agbakụtala* Onyenwe anyị azụ, fee arụsị Baal na Ashtọret. Ma ugbu a, napụta anyị site nʼaka ndị iro anyị, anyị ga-efekwa gị.’

1 Samuel 12:10 in English

1 Samuel 12:10 · Berean Standard Bible

Then they cried out to the LORD and said, ‘We have sinned, for we have forsaken the LORD and served the Baals and Ashtoreths. Now deliver us from the hands of our enemies, that we may serve You.’

Context

8“Mgbe ụmụ Jekọb batara Ijipt, ha kpọkuru Onyenwe anyị ka o nyere ha aka. Onyenwe anyị zitere Mosis na Erọn, ndị kpọpụtara nna nna unu ha site nʼIjipt, mee ka ha bịa biri nʼebe a. 9“Ma ha chefuru Onyenwe anyị bụ Chineke ha, nʼihi ya o nyefere ha nʼaka Sisera, bụ ọchịagha eze Hazọ, nakwa nʼaka ndị Filistia, na eze ndị Moab, bụ ndị lụsoro ha ọgụ. 10Ha tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, sị ya, ‘Anyị emehiela,* anyị agbakụtala* Onyenwe anyị azụ, fee arụsị Baal na Ashtọret. Ma ugbu a, napụta anyị site nʼaka ndị iro anyị, anyị ga-efekwa gị.’ 11Onyenwe anyị zitere Jerub-Baal, na Barak,* na Jefta, na Samuel, ka ha zọpụta unu site nʼaka ndị iro nọ unu gburugburu, mee ka unu biri nʼudo. 12“Ma mgbe unu hụrụ na Nahash, eze ndị Amọn na-achọ ibuso unu agha, unu tụrụ egwu bịakwute m sị m, ‘Mba, anyị chọrọ eze ga-achị anyị,’ nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị Chineke unu bụ eze unu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.