1 Samuel 12:8
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Mgbe ụmụ Jekọb batara Ijipt, ha kpọkuru Onyenwe anyị ka o nyere ha aka. Onyenwe anyị zitere Mosis na Erọn, ndị kpọpụtara nna nna unu ha site nʼIjipt, mee ka ha bịa biri nʼebe a.
1 Samuel 12:8 in English
1 Samuel 12:8 · Berean Standard Bible
When Jacob went to Egypt,* your fathers cried out to the LORD, and He sent them Moses and Aaron, who brought your fathers out of Egypt and settled them in this place.
Context
6Samuel gakwara nʼihu nʼokwu ya sị, “Ọ bụ Onyenwe anyị họpụtara Mosis na Erọn. Ọ bụkwa ya mere ka nna nna unu ha si nʼIjipt pụta. 7Ugbu a, guzonụ jụ nʼebe a nʼihu Onyenwe anyị ka m chetara unu ihe ọma niile Onyenwe anyị meere unu na nna nna unu ha. 8“Mgbe ụmụ Jekọb batara Ijipt, ha kpọkuru Onyenwe anyị ka o nyere ha aka. Onyenwe anyị zitere Mosis na Erọn, ndị kpọpụtara nna nna unu ha site nʼIjipt, mee ka ha bịa biri nʼebe a. 9“Ma ha chefuru Onyenwe anyị bụ Chineke ha, nʼihi ya o nyefere ha nʼaka Sisera, bụ ọchịagha eze Hazọ, nakwa nʼaka ndị Filistia, na eze ndị Moab, bụ ndị lụsoro ha ọgụ. 10Ha tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, sị ya, ‘Anyị emehiela,* anyị agbakụtala* Onyenwe anyị azụ, fee arụsị Baal na Ashtọret. Ma ugbu a, napụta anyị site nʼaka ndị iro anyị, anyị ga-efekwa gị.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.