1 Samuel 12:11
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị zitere Jerub-Baal, na Barak,* na Jefta, na Samuel, ka ha zọpụta unu site nʼaka ndị iro nọ unu gburugburu, mee ka unu biri nʼudo.
1 Samuel 12:11 in English
1 Samuel 12:11 · Berean Standard Bible
So the LORD sent Jerubbaal,* Barak,* Jephthah, and Samuel,* and He delivered you from the hands of your enemies on every side, and you dwelt securely.
Context
9“Ma ha chefuru Onyenwe anyị bụ Chineke ha, nʼihi ya o nyefere ha nʼaka Sisera, bụ ọchịagha eze Hazọ, nakwa nʼaka ndị Filistia, na eze ndị Moab, bụ ndị lụsoro ha ọgụ. 10Ha tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, sị ya, ‘Anyị emehiela,* anyị agbakụtala* Onyenwe anyị azụ, fee arụsị Baal na Ashtọret. Ma ugbu a, napụta anyị site nʼaka ndị iro anyị, anyị ga-efekwa gị.’ 11Onyenwe anyị zitere Jerub-Baal, na Barak,* na Jefta, na Samuel, ka ha zọpụta unu site nʼaka ndị iro nọ unu gburugburu, mee ka unu biri nʼudo. 12“Ma mgbe unu hụrụ na Nahash, eze ndị Amọn na-achọ ibuso unu agha, unu tụrụ egwu bịakwute m sị m, ‘Mba, anyị chọrọ eze ga-achị anyị,’ nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị Chineke unu bụ eze unu. 13Ugbu a, leenụ eze unu họpụtara, nʼihi na ọ bụ unu rịọrọ Onyenwe anyị ka o nye unu ya; Onyenwe anyị azakwala arịrịọ unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.