1 Samuel 11:13
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Sọl zara sị, “O nweghị onye ọbụla a ga-egbu taa, nʼihi na taa, Onyenwe anyị anapụtala Izrel!”
1 Samuel 11:13 in English
1 Samuel 11:13 · Berean Standard Bible
But Saul ordered, “No one shall be put to death this day, for today the LORD has worked salvation in Israel.”
Context
11Ma nʼụtụtụ echi, Sọl na ndị agha ya bịaruru. O kewara ndị agha ya ụzọ atọ, buso ụmụ Amọn agha na mberede nʼisi ụtụtụ. O gbugidere ha ụtụtụ niile ruo mgbe anyanwụ chara nʼuju ya, chụsasịa ndị fọdụrụ nʼime ha. Nke a mere na o nweghị ebe a ga-ahụ ka ndị agha Amọn abụọ nọkọtara. 12Ndị Izrel niile bịakwutere Samuel jụọ ya sị, “Olee ndị ahụ sị na Sọl agaghị abụ eze anyị? Kpọpụtara anyị ha ka anyị gbuo ha!” 13Ma Sọl zara sị, “O nweghị onye ọbụla a ga-egbu taa, nʼihi na taa, Onyenwe anyị anapụtala Izrel!” 14Samuel gwara ha sị, “Bịanụ ka anyị gaa Gilgal mee ịbụ eze a ka ọ dị ọhụrụ ọzọ.” 15Ya mere, mmadụ niile gara Gilgal. Na mmemme pụrụ iche, ha mere Sọl eze nʼihu Onyenwe anyị. Ha chụkwara aja udo nye Onyenwe anyị nʼebe ahụ. Ọṅụ jupụtakwara nʼobi Sọl na ndị Izrel niile.
11:1 Ndị Amọn bụ ụmụ ụmụ Lọt, Jen 19:38; Dit 2:19 nʼoge Ndị Ikpe na-achị nʼIzrel, ha gbalịrị ibuso ha agha ka ha nara ha ala ha. Nkp 3:13; 11:4-33
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.