1 Samuel 1:16
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Biko agụla ohu gị nwanyị dịka onye ajọ omume. Esi m nʼobi mwute na-akwasara Onyenwe anyị ụwa m.”
1 Samuel 1:16 in English
1 Samuel 1:16 · Berean Standard Bible
Do not take your servant for a wicked woman; for all this time I have been praying out of the depth of my anguish and grief.”
Context
14Elayị sịrị ya, “Ruo ole mgbe ka ị ga-akwụsị ịṅụbiga mmanya oke? Si nʼebe mmanya dị wezuga onwe gị!” 15Ma Hana zara sị ya, “Mba, onyenwe m, aṅụghị m mmanya ọbụla! Kama abụ m nwanyị obi ya dị ilu nke ukwuu. Anọ m na-ekwupụtara Onyenwe anyị ihe dị m nʼobi. 16Biko agụla ohu gị nwanyị dịka onye ajọ omume. Esi m nʼobi mwute na-akwasara Onyenwe anyị ụwa m.” 17Elayị zara sị ya, “Laa nʼudo, ka Chineke Izrel mezuoro gị dịka arịrịọ gị niile si dị.” 18Hana zara sị, “Ka m bụrụ onye si nʼaka gị nata ihuọma.” O jiri obi ụtọ laghachi, malitekwa iri nri ya. Ihu ya agbarụkwaghị ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.