Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Hana zara sị ya, “Mba, onyenwe m, aṅụghị m mmanya ọbụla! Kama abụ m nwanyị obi ya dị ilu nke ukwuu. Anọ m na-ekwupụtara Onyenwe anyị ihe dị m nʼobi.

1 Samuel 1:15 in English

1 Samuel 1:15 · Berean Standard Bible

“No, my lord,” Hannah replied. “I am a woman oppressed in spirit. I have not had any wine or strong drink, but I have poured out my soul before the LORD.

Context

13Ka Hana nọ na-ekpe ekpere nʼobi ya, naanị egbugbere ọnụ ya na-emegharị emegharị, ma enweghị onye na-anụ olu ya. Mgbe ahụ, Elayị chere nʼobi ya na ọ bụ nwanyị mmanya na-egbu. 14Elayị sịrị ya, “Ruo ole mgbe ka ị ga-akwụsị ịṅụbiga mmanya oke? Si nʼebe mmanya dị wezuga onwe gị!” 15Ma Hana zara sị ya, “Mba, onyenwe m, aṅụghị m mmanya ọbụla! Kama abụ m nwanyị obi ya dị ilu nke ukwuu. Anọ m na-ekwupụtara Onyenwe anyị ihe dị m nʼobi. 16Biko agụla ohu gị nwanyị dịka onye ajọ omume. Esi m nʼobi mwute na-akwasara Onyenwe anyị ụwa m.” 17Elayị zara sị ya, “Laa nʼudo, ka Chineke Izrel mezuoro gị dịka arịrịọ gị niile si dị.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.