1 Pita 5:12
1 Peter 5:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ site nʼinyeaka Saịlas onye m hụtara dị ka nwanna kwesiri ntụkwasị obi ka m ji deere unu mkpụrụ okwu ole na ole ndị a nke m ji agbaa unu ume na-ekwupụtakwa na nke a bụ eziokwu dị nʼamara Chineke. Guzosienụ ike nʼime ya.
1 Peter 5:12 in English
1 Peter 5:12 · Berean Standard Bible
Through Silvanus,* whom I regard as a faithful brother, I have written to you briefly, encouraging you and testifying that this is the true grace of God. Stand firm in it.
Context
10Chineke onye nwe amara niile, onye kpọbatara unu na ebube ebighị ebi ya nʼime Kraịst, mgbe unu hụrụ ahụhụ ndị a nwa oge, ya onwe ya ga-eweghachi unu nʼọnọdụ unu, mee ka unu dị nnọọ ike, ndị guzo chịm ma kwesikwa ntụkwasị obi. 11Ọ bụ ya nwe ike niile ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. 12Ọ bụ site nʼinyeaka Saịlas onye m hụtara dị ka nwanna kwesiri ntụkwasị obi ka m ji deere unu mkpụrụ okwu ole na ole ndị a nke m ji agbaa unu ume na-ekwupụtakwa na nke a bụ eziokwu dị nʼamara Chineke. Guzosienụ ike nʼime ya. 13Nwanyị ahụ nọ na Babilọn, nke a họpụtara unu na ya, na-ekele unu. Mak, ezi nwa m nwoke na-ekelekwa unu. 14Jirinụ isurita ọnụ ịhụnanya kelerịta onwe unu.
Ka udo dịnyere unu niile nọ nʼime Kraịst.
5:5 Ilu 3:34
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.