Native Bible

1 Kings 8:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma nʼezie, ewuola m ụlọnsọ pụrụ iche, maa mma nye gị, ebe ị ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi.”

1 Kings 8:13 in English

1 Kings 8:13 · Berean Standard Bible

I have indeed built You an exalted house, a place for You to dwell forever.”

Context

11Ndị nchụaja enwekwaghị ike jee ozi ha, nʼihi igwe ojii ahụ, nʼihi na ebube Onyenwe anyị jupụtara nʼime ụlọnsọ ya. 12Mgbe ahụ, Solomọn sịrị, “Onyenwe anyị ekwuola na ọ ga-ebi nʼoke igwe ojii. 13Ma nʼezie, ewuola m ụlọnsọ pụrụ iche, maa mma nye gị, ebe ị ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi.” 14Dịka ọgbakọ Izrel niile na-eguzo nʼebe ahụ, eze chigharịrị onwe ya chee ha ihu, gọzie ha. 15Mgbe ahụ, ọ sịrị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel, onye ji aka ya mezuo nkwa nke o sitere nʼọnụ ya kwee nna m Devid. Nʼihi na o kwuru sị,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.