Native Bible

1 Kings 8:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, ọ sịrị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel, onye ji aka ya mezuo nkwa nke o sitere nʼọnụ ya kwee nna m Devid. Nʼihi na o kwuru sị,

1 Kings 8:15 in English

1 Kings 8:15 · Berean Standard Bible

and said: “Blessed be the LORD, the God of Israel, who has fulfilled with His own hand what He spoke with His mouth to my father David, saying,

Context

13Ma nʼezie, ewuola m ụlọnsọ pụrụ iche, maa mma nye gị, ebe ị ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi.” 14Dịka ọgbakọ Izrel niile na-eguzo nʼebe ahụ, eze chigharịrị onwe ya chee ha ihu, gọzie ha. 15Mgbe ahụ, ọ sịrị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel, onye ji aka ya mezuo nkwa nke o sitere nʼọnụ ya kwee nna m Devid. Nʼihi na o kwuru sị, 16‘Site nʼụbọchị ahụ m si nʼala Ijipt kpọpụta ndị m, ahọpụtaghị m obodo ọbụla nʼebo ọbụla nke Izrel, ka e wuru m ụlọnsọ ka Aha m dịrị nʼebe ahụ. Ma a họrọla m Devid ị bụ onye ga-achị ndị m Izrel.’ 17“Nna m, Devid bu nʼobi iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.