Native Bible

1 Kings 7:40 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ kpụkwara ite dị iche iche, shọvel niile, na efere ịkwọsa mmiri niile. Nʼikpeazụ, ọ rụchara ọrụ niile dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, nke eze Solomọn tinyere ya nʼaka ịrụ.

1 Kings 7:40 in English

1 Kings 7:40 · Berean Standard Bible

Additionally, Huram made the pots,* shovels, and sprinkling bowls. So Huram finished all the work that he had undertaken for King Solomon in the house of the LORD:

Context

38Huram jikwa bronz kpụọ efere ịsa ihe iri. Ogbu efere ọbụla dị mita abụọ na otu ụma, otu efere maka ihe ndọkwasị ọbụla. Mmiri na-eju otu nʼime ha bụ narị galọọnụ mmiri abụọ na iri anọ.* 39Ọ dọnyere ihe ndọkwasị ọla ise nʼakụkụ ndịda ụlọnsọ ukwu ahụ, dọnyekwa ihe ndọkwasị ọla ise nke ọzọ nʼakụkụ ugwu. Ọ dọbara ihe ichenye mmiri ukwu ahụ nʼakụkụ ndịda, nʼihu ọwụwa anyanwụ nke ụlọnsọ ahụ, nʼebe chere ihu na ndịda. 40Ọ kpụkwara ite dị iche iche, shọvel niile, na efere ịkwọsa mmiri niile. Nʼikpeazụ, ọ rụchara ọrụ niile dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, nke eze Solomọn tinyere ya nʼaka ịrụ. 41Ogidi abụọ ahụ; ihe ọkpụkpụ abụọ dịka efere dị nʼelu ogidi abụọ ahụ; ihe ọkpụkpụ yiri ụdọ a tụrụ atụ nke e ji chọọ ihe ọkpụkpụ abụọ ahụ dịka efere mma. 42Narị anọ nke mkpụrụ pomegranet a kpụrụ akpụ maka ahịrị ihe abụọ ahụ a kpụrụ akpụ, ya bụ, ahịrị pomegranet abụọ nʼihi otu ihe ọkpụkpụ, iji chọọ ihe ọkpụkpụ ahụ yiri efere dị nʼisi elu ogidi ahụ mma.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.