Native Bible

1 Kings 7:39 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ dọnyere ihe ndọkwasị ọla ise nʼakụkụ ndịda ụlọnsọ ukwu ahụ, dọnyekwa ihe ndọkwasị ọla ise nke ọzọ nʼakụkụ ugwu. Ọ dọbara ihe ichenye mmiri ukwu ahụ nʼakụkụ ndịda, nʼihu ọwụwa anyanwụ nke ụlọnsọ ahụ, nʼebe chere ihu na ndịda.

1 Kings 7:39 in English

1 Kings 7:39 · Berean Standard Bible

He set five stands on the south side of the temple and five on the north, and he put the Sea on the south side, at the southeast corner of the temple.

Context

37Ihe ndọkwasị ọla iri ndị ahụ ha otu. Ha yikwara ibe ha, nʼihi na e mere ka ha nwee otu ụdị. 38Huram jikwa bronz kpụọ efere ịsa ihe iri. Ogbu efere ọbụla dị mita abụọ na otu ụma, otu efere maka ihe ndọkwasị ọbụla. Mmiri na-eju otu nʼime ha bụ narị galọọnụ mmiri abụọ na iri anọ.* 39Ọ dọnyere ihe ndọkwasị ọla ise nʼakụkụ ndịda ụlọnsọ ukwu ahụ, dọnyekwa ihe ndọkwasị ọla ise nke ọzọ nʼakụkụ ugwu. Ọ dọbara ihe ichenye mmiri ukwu ahụ nʼakụkụ ndịda, nʼihu ọwụwa anyanwụ nke ụlọnsọ ahụ, nʼebe chere ihu na ndịda. 40Ọ kpụkwara ite dị iche iche, shọvel niile, na efere ịkwọsa mmiri niile. Nʼikpeazụ, ọ rụchara ọrụ niile dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, nke eze Solomọn tinyere ya nʼaka ịrụ. 41Ogidi abụọ ahụ; ihe ọkpụkpụ abụọ dịka efere dị nʼelu ogidi abụọ ahụ; ihe ọkpụkpụ yiri ụdọ a tụrụ atụ nke e ji chọọ ihe ọkpụkpụ abụọ ahụ dịka efere mma.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.