1 Ndị Eze 7:4
1 Kings 7:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Oghereikuku ya dịkwa nʼụzọ ahịrị atọ, otu nʼelu ibe ya. E mere ka oghereikuku ndị dị nʼelu nʼotu akụkụ chee oghereikuku ndị dị nʼakụkụ nke ọzọ ihu.
1 Kings 7:4 in English
1 Kings 7:4 · Berean Standard Bible
There were three rows of high windows facing one another in three tiers.
Context
2O wuru ụlọeze ukwu aha ya bụ Oke Ọhịa Lebanọn,* nke ogologo ya dị iri mita ise, obosara ya dị iri mita abụọ na ise. Otu a kwa, ịdị elu ya dị mita iri na ise. Osisi sida ukwu e ji rụọ elu ya ka e mere ka ha nọkwasị nʼelu ogidi e doro nʼahịrị nʼahịrị. Ahịrị ogidi ndị a dịkwa anọ. 3Ọ bụkwa osisi sida ka e ji machie elu ụlọ ahụ. A kụkwasịrị osisi ndị a nʼelu osisi sida ukwu ndị a a wara awa, ndị e mere ka ha nọkwasị nʼogidi ndị ahụ. Ọnụọgụgụ osisi ndị ahụ bụ iri anọ na ise. Ọ bụkwa iri na ise ka e nwere nʼahịrị ọbụla. 4Oghereikuku ya dịkwa nʼụzọ ahịrị atọ, otu nʼelu ibe ya. E mere ka oghereikuku ndị dị nʼelu nʼotu akụkụ chee oghereikuku ndị dị nʼakụkụ nke ọzọ ihu. 5Ọnụ ụzọ niile nwere mbudo ọnụ ụzọ anọ. Ha dị atọ atọ cherịtara ibe ha ihu nʼebe mpụta ya. 6O wuru ọnụ ụzọ mbata nke ogidi, nke ruru iri mita na anọ nʼobosara, rukwaa iri mita anọ na ise nʼịdị ogologo. Nʼihu ya, e nwere mpụta ọnụ ụlọ, nʼihu ya, e nwekwara ogidi na elu ebe kpuchiri ekpuchi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.