Native Bible

1 Kings 7:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe ndọkwasị ahụ nwere ihe e ji jikọta ya dị nʼetiti ya. Otu a ka e si mee ihe ndọkwasị ahụ.

1 Kings 7:28 in English

1 Kings 7:28 · Berean Standard Bible

This was the design of the stands: They had side panels attached to uprights,

Context

26Ịdị arọ ya ha ka otu ọtụtụ ntu-aka dimkpa. E mere ọnụ ya ka ọ dị ka ọnụ iko mmiri, dịkwa ka okoko lili na-awapụta awapụta. Ọ na-erite puku galọọnụ iri na abụọ. 27O mekwara ihe ndọkwasị bronz iri, nke e nwere ike ịkpụgharị akpụgharị. Mita abụọ ka ogologo nke otu ihe ndọkwasị ọbụla dị, mita abụọ ka obosara ya dịkwa; ịdị elu ya dị otu mita na ọkara. 28Ihe ndọkwasị ahụ nwere ihe e ji jikọta ya dị nʼetiti ya. Otu a ka e si mee ihe ndọkwasị ahụ. 29Nʼelu ihe njikọta ahụ ka a wụrụ oyiyi dị iche iche, dịka ọdụm, na oke ehi, na ndị mmụọ ozi cherubim nwere nku. Nʼelu, na nʼokpuru ọdụm, na oke ehi ndị ahụ, a wụkwara ahịhịa na okoko osisi dị iche iche. 30Otu ihe ndọkwasị ọbụla nwere ụkwụ bronz anọ dị gburugburu, nweekwa okporo bronz ebe ụkwụ ndị a na-agbagharị. Nʼakụkụ anọ nke ihe ndọkwasị ndị a, a rụnyere ebe a na-adọkwasị efere. E ji oyiyi okoko osisi na ahịhịa chọọ ihe ndị a mma.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.