Native Bible

1 Kings 7:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼelu ihe njikọta ahụ ka a wụrụ oyiyi dị iche iche, dịka ọdụm, na oke ehi, na ndị mmụọ ozi cherubim nwere nku. Nʼelu, na nʼokpuru ọdụm, na oke ehi ndị ahụ, a wụkwara ahịhịa na okoko osisi dị iche iche.

1 Kings 7:29 in English

1 Kings 7:29 · Berean Standard Bible

and on the panels between the uprights were lions, oxen, and cherubim. On the uprights was a pedestal above, and below the lions and oxen were wreaths of beveled work.

Context

27O mekwara ihe ndọkwasị bronz iri, nke e nwere ike ịkpụgharị akpụgharị. Mita abụọ ka ogologo nke otu ihe ndọkwasị ọbụla dị, mita abụọ ka obosara ya dịkwa; ịdị elu ya dị otu mita na ọkara. 28Ihe ndọkwasị ahụ nwere ihe e ji jikọta ya dị nʼetiti ya. Otu a ka e si mee ihe ndọkwasị ahụ. 29Nʼelu ihe njikọta ahụ ka a wụrụ oyiyi dị iche iche, dịka ọdụm, na oke ehi, na ndị mmụọ ozi cherubim nwere nku. Nʼelu, na nʼokpuru ọdụm, na oke ehi ndị ahụ, a wụkwara ahịhịa na okoko osisi dị iche iche. 30Otu ihe ndọkwasị ọbụla nwere ụkwụ bronz anọ dị gburugburu, nweekwa okporo bronz ebe ụkwụ ndị a na-agbagharị. Nʼakụkụ anọ nke ihe ndọkwasị ndị a, a rụnyere ebe a na-adọkwasị efere. E ji oyiyi okoko osisi na ahịhịa chọọ ihe ndị a mma. 31Nʼime ihe ndọkwasị ahụ, e nwere oghere nke nwere ọnụ dị gburugburu nke ịdị omimi ya bụ sentimita iri anọ na ise. Oghere a dị gburugburu, nwee ebe ndọkwasị nʼokpuru ya nke dị sentimita iri isii na asatọ nʼọtụtụ. Oyiyi ihe apịrị apị dịkwa gburugburu ọnụ ya. Ihe njikọta ha niile nwere akụkụ anọ nke ha nʼotu, ha adịghị gburugburu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.