1 Ndị Eze 6:4
1 Kings 6:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O meere ụlọnsọ ahụ oghereikuku kpara nkpa nʼime ma saa mbara nʼezi, nʼebe elu elu mgbidi ụlọ ahụ.
1 Kings 6:4 in English
1 Kings 6:4 · Berean Standard Bible
He also had narrow windows framed high in the temple.
Context
2Ụlọnsọ nke eze Solomọn wuuru Onyenwe anyị dị iri mita abụọ na asaa nʼogologo, mita itoolu nʼobosara, ebe ịla elu ya dịkwa mita iri na anọ. 3Mpụta ọnụ ụlọ nke dị nʼihu ụlọ ezumezu nke ụlọnsọ ahụ dị mita itoolu nʼogologo nke gbakwunyere ihe nʼobosara ụlọnsọ ahụ, dịrịkwa mita anọ na ọkara nʼobosara ya. 4O meere ụlọnsọ ahụ oghereikuku kpara nkpa nʼime ma saa mbara nʼezi, nʼebe elu elu mgbidi ụlọ ahụ. 5Nʼakụkụ mgbidi ụlọ ezumezu ahụ nakwa mgbidi nke ime ebe nsọ ahụ, o wuru okpukpu gburugburu ụlọ ahụ, nke nwere ọtụtụ ụlọ nta dị iche iche gbaa gburugburu. 6Obosara okpukpu ụlọ nke dịkarịsịrị ala* bụ mita abụọ na ọkara, obosara okpukpu nke ụlọ etiti dị mita atọ, otu a kwa, obosara okpukpu ụlọ nke atọ dị mita atọ na ọkara. Mgbe e wuru mgbidi gbara ụlọnsọ ukwu ahụ gburugburu, e wukwara ihe dịka aka nʼakụkụ mgbidi ahụ niile. Ọ bụ nʼelu ihe ndị a dịka aka ka e dokwasịrị osisi e ji wuo ọnụụlọ nta ndị ahụ. Nʼụzọ dị otu a, ka e ji gbochie ịmanye ihe ọbụla nʼaja ụlọnsọ ukwu ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.