1 Ndị Eze 6:5
1 Kings 6:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼakụkụ mgbidi ụlọ ezumezu ahụ nakwa mgbidi nke ime ebe nsọ ahụ, o wuru okpukpu gburugburu ụlọ ahụ, nke nwere ọtụtụ ụlọ nta dị iche iche gbaa gburugburu.
1 Kings 6:5 in English
1 Kings 6:5 · Berean Standard Bible
Against the walls of the temple and the inner sanctuary, Solomon built a chambered structure around the temple, in which he constructed the side rooms.
Context
3Mpụta ọnụ ụlọ nke dị nʼihu ụlọ ezumezu nke ụlọnsọ ahụ dị mita itoolu nʼogologo nke gbakwunyere ihe nʼobosara ụlọnsọ ahụ, dịrịkwa mita anọ na ọkara nʼobosara ya. 4O meere ụlọnsọ ahụ oghereikuku kpara nkpa nʼime ma saa mbara nʼezi, nʼebe elu elu mgbidi ụlọ ahụ. 5Nʼakụkụ mgbidi ụlọ ezumezu ahụ nakwa mgbidi nke ime ebe nsọ ahụ, o wuru okpukpu gburugburu ụlọ ahụ, nke nwere ọtụtụ ụlọ nta dị iche iche gbaa gburugburu. 6Obosara okpukpu ụlọ nke dịkarịsịrị ala* bụ mita abụọ na ọkara, obosara okpukpu nke ụlọ etiti dị mita atọ, otu a kwa, obosara okpukpu ụlọ nke atọ dị mita atọ na ọkara. Mgbe e wuru mgbidi gbara ụlọnsọ ukwu ahụ gburugburu, e wukwara ihe dịka aka nʼakụkụ mgbidi ahụ niile. Ọ bụ nʼelu ihe ndị a dịka aka ka e dokwasịrị osisi e ji wuo ọnụụlọ nta ndị ahụ. Nʼụzọ dị otu a, ka e ji gbochie ịmanye ihe ọbụla nʼaja ụlọnsọ ukwu ahụ. 7Mgbe a na-ewu ụlọnsọ ukwu ahụ, ọ bụ naanị nkume awara nke ọma nʼebe a nọ gwupụta ha ka eji wuo ya. O nweghị onye nụrụ ụzụ itipịa nkume, maọbụ ụzụ ịwa osisi, maọbụ ụdị mkpọtụ ahụ ngwa ọrụ mkpirisi igwe na-eme, nʼebe a nọ wuo ụlọnsọ ukwu ahụ, mgbe a na-ewu ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.