Native Bible

1 Kings 6:37 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụ nʼọnwa Ziv, nʼafọ nke anọ, nke ịbụ eze Solomọn ka a tọrọ ntọala ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

1 Kings 6:37 in English

1 Kings 6:37 · Berean Standard Bible

The foundation of the house of the LORD was laid in the fourth year of Solomon’s reign, in the month of Ziv.

Context

35Ọ pịrị oyiyi cherubim na oyiyi nkwụ, na oyiyi okoko osisi wara awa, jiri ọlaedo techie ibo ndị ahụ na oyiyi a pịkwasịrị ha. 36O wuru ogige nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ bụ ahịrị nkume atọ e doziri edozi na otu ahịrị osisi sida a kwachara nke ọma ka e ji wuo ogige a. 37Ọ bụ nʼọnwa Ziv, nʼafọ nke anọ, nke ịbụ eze Solomọn ka a tọrọ ntọala ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. 38Ọ bụ nʼime afọ iri na otu, nʼọnwa Bul,* ya bụ ọnwa nke asatọ, ka e wusiri ụlọnsọ ukwu ahụ, nʼihe niile ya dịka ntụziaka e nyere si dị. Ọ bụ afọ asaa ka o weere ya i ji rụchaa ụlọnsọ ukwu ahụ. 6:1 Ọnwa Zif, bụ ọnwa abụọ nʼafọ, nʼọnụọgụgụ afọ ndị Juu ma bụrụ ọnwa ise nʼafọ nʼọnụọgụgụ afọ ugbu. 6:6 Maọbụ, ụlọ nke mbụ dị nʼala 6:20 Ọpụ 37:25-28; 1Ez 7:48-50 6:20 Ogologo ime ime nʼụlọnsọ ukwu a, bụ ọtụtụ abụọ, ma a tụnyere ya na Ebe Kachasị Nsọ nke ụlọ nzute ahụ. Ọpụ 26 6:38 Ọnwa Bul, bụ ọnwa nke asatọ, nʼọnụọgụgụ afọ ndị Juu, ma bụrụ ọnwa iri nʼafọ nʼọnụọgụgụ ugbu a.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.