1 Ndị Eze 6:36
1 Kings 6:36 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O wuru ogige nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ bụ ahịrị nkume atọ e doziri edozi na otu ahịrị osisi sida a kwachara nke ọma ka e ji wuo ogige a.
1 Kings 6:36 in English
1 Kings 6:36 · Berean Standard Bible
Solomon built the inner courtyard with three rows of dressed stone and one row of trimmed cedar beams.
Context
34O jikwa osisi junipa mee ibo abụọ a na-emechikọta nʼotu. 35Ọ pịrị oyiyi cherubim na oyiyi nkwụ, na oyiyi okoko osisi wara awa, jiri ọlaedo techie ibo ndị ahụ na oyiyi a pịkwasịrị ha. 36O wuru ogige nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ bụ ahịrị nkume atọ e doziri edozi na otu ahịrị osisi sida a kwachara nke ọma ka e ji wuo ogige a. 37Ọ bụ nʼọnwa Ziv, nʼafọ nke anọ, nke ịbụ eze Solomọn ka a tọrọ ntọala ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. 38Ọ bụ nʼime afọ iri na otu, nʼọnwa Bul,* ya bụ ọnwa nke asatọ, ka e wusiri ụlọnsọ ukwu ahụ, nʼihe niile ya dịka ntụziaka e nyere si dị. Ọ bụ afọ asaa ka o weere ya i ji rụchaa ụlọnsọ ukwu ahụ.
6:1 Ọnwa Zif, bụ ọnwa abụọ nʼafọ, nʼọnụọgụgụ afọ ndị Juu ma bụrụ ọnwa ise nʼafọ nʼọnụọgụgụ afọ ugbu.
6:6 Maọbụ, ụlọ nke mbụ dị nʼala
6:20 Ọpụ 37:25-28; 1Ez 7:48-50
6:20 Ogologo ime ime nʼụlọnsọ ukwu a, bụ ọtụtụ abụọ, ma a tụnyere ya na Ebe Kachasị Nsọ nke ụlọ nzute ahụ. Ọpụ 26
6:38 Ọnwa Bul, bụ ọnwa nke asatọ, nʼọnụọgụgụ afọ ndị Juu, ma bụrụ ọnwa iri nʼafọ nʼọnụọgụgụ ugbu a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.