Native Bible

1 Kings 6:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O tinyere cherubim ndị a nke gbasapụrụ nku ha nʼime ime Ebe Nsọ Kachasị Nsọ nke ụlọnsọ ukwu. Ọnụ ọnụ nke nku cherub ọbụla na-emetụ otu akụkụ ahụ ụlọ ahụ, ebe ọnụ ọnụ nke nku cherub ọbụla na-emetụ na nke ibe ya nʼetiti ọnụụlọ ahụ.

1 Kings 6:27 in English

1 Kings 6:27 · Berean Standard Bible

And he placed the cherubim inside the innermost room of the temple. Since their wings were spread out, the wing of the first cherub touched one wall, while the wing of the second cherub touched the other wall, and in the middle of the room their wingtips touched.

Context

25Cherub nke abụọ dịkwa iri mita na ụma isii, nʼihi na cherubim abụọ ndị a bụ otu nʼọtụtụ nakwa nʼibu ibu. 26Ịdị elu nke cherub ọbụla ruru mita ise na ụma isii. 27O tinyere cherubim ndị a nke gbasapụrụ nku ha nʼime ime Ebe Nsọ Kachasị Nsọ nke ụlọnsọ ukwu. Ọnụ ọnụ nke nku cherub ọbụla na-emetụ otu akụkụ ahụ ụlọ ahụ, ebe ọnụ ọnụ nke nku cherub ọbụla na-emetụ na nke ibe ya nʼetiti ọnụụlọ ahụ. 28O jiri ọlaedo machie cherubim ndị ahụ. 29Nʼahụ aja ụlọnsọ ukwu ahụ gbaa gburugburu, ma nʼime ọnụụlọ nke dị nʼime na ndị dị na mpụta, ka ọ pịkwasịrị oyiyi cherubim, osisi nkwụ na okoko osisi wara awa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.