1 Ndị Eze 6:13
1 Kings 6:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m ebikwa nʼetiti ndị Izrel, agaghị m ahapụkwa ndị m, Izrel.”
1 Kings 6:13 in English
1 Kings 6:13 · Berean Standard Bible
And I will dwell among the Israelites and will not abandon My people Israel.”
Context
11Okwu Onyenwe anyị rutere Solomọn ntị, 12“Banyere ụlọnsọ ukwu a i na-ewu, ọ bụrụ na i mee ihe m gwara gị, gbasoo ihe niile m nyere gị nʼiwu, ma mezuo okwu m niile, aga m esite na gị mezuo nkwa ahụ m kwere nna gị Devid. 13Aga m ebikwa nʼetiti ndị Izrel, agaghị m ahapụkwa ndị m, Izrel.” 14Emesịa, Solomọn wusiri ụlọnsọ ukwu ahụ. 15O ji osisi sida dị obosara machie ahụ ime ụlọnsọ ukwu ahụ site nʼakụkụ ala ruo nʼelu ya. E jikwa osisi junipa machie ala ụlọ ahụ niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.