Native Bible

1 Kings 4:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ben-Geba, onye na-achị Ramọt Gilead, na obodo niile nke ikwu Jaịa, nwa Manase nwere nʼime Gilead, na akụkụ Agob niile nke dị na Bashan, na iri obodo ukwu isii e ji mgbidi gbaa gburugburu, nke nwekwara mkpọrọ bronz e ji kpụọ ụzọ ya.

1 Kings 4:13 in English

1 Kings 4:13 · Berean Standard Bible

Ben-geber in Ramoth-gilead (the villages of Jair son of Manasseh in Gilead belonged to him, as well as the region of Argob in Bashan with its sixty great cities with walls and bronze bars);

Context

11Ben-Abinadab, onye na-achị ala elu elu Doa. Nwoke a lụrụ Tafat, nwa nwanyị Solomọn. 12Baana, nwa Ahilud, onye na-achị Teanak, na Megido nʼakụkụ Bet-Shan niile, nke dị nʼakụkụ Zaretan na ndịda Jezril, sitekwa na Bet-Shan ruo Ebel-Mehola gafee ma ruokwa Jokmeam. 13Ben-Geba, onye na-achị Ramọt Gilead, na obodo niile nke ikwu Jaịa, nwa Manase nwere nʼime Gilead, na akụkụ Agob niile nke dị na Bashan, na iri obodo ukwu isii e ji mgbidi gbaa gburugburu, nke nwekwara mkpọrọ bronz e ji kpụọ ụzọ ya. 14Ahinadab nwa Ido, onye na-achị Mahanaim. 15Ahimaaz, onye na-achị Naftalị (ọ lụkwara nwa nwanyị Solomọn a na-akpọ Basemat).

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.