Native Bible

1 Kings 3:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, eze kpebiri ikpe sị, “Kuru nwantakịrị a dị ndụ kunye ya nwanyị ahụ chọrọ ka ọ dị ndụ. Egbula ya, nʼihi na nwanyị ahụ bụ nne ya.”

1 Kings 3:27 in English

1 Kings 3:27 · Berean Standard Bible

Then the king gave his ruling: “Give the living baby to the first woman. By no means should you kill him; she is his mother.”

Context

25Eze nyere iwu sị, “Kpọwaa nwa ahụ dị ndụ ụzọ abụọ, were otu ọkara nye otu onye, werekwa nke ọzọ nye onye nke ọzọ.” 26Nwanyị ahụ nwa ya dị ndụ jupụtara nʼọmịiko nʼebe nwa ya nọ, ọ gwara eze sị, “Biko, onyenwe m, kunye ya nwantakịrị ahụ dị ndụ. Egbukwala ya.” Ma onye nke ọzọ sịrị, “Kpọwaa ya abụọ. Nwa a agaghị abụ nke gị, ọ gaghị abụkwa nke m.” 27Mgbe ahụ, eze kpebiri ikpe sị, “Kuru nwantakịrị a dị ndụ kunye ya nwanyị ahụ chọrọ ka ọ dị ndụ. Egbula ya, nʼihi na nwanyị ahụ bụ nne ya.” 28Mgbe ndị Izrel niile nụrụ otu eze si kpebie ikpe a, ha sitere nʼịtụ egwu nye eze nsọpụrụ, nʼihi na ha hụrụ na o si nʼaka Chineke nweta amamihe* ikpe ikpe ziri ezi. 3:7 Ọ bụghị nwantakịrị nʼọnụọgụgụ afọ kama ọ bụ nʼamamihe, nʼihi nʼoge a, ọ bụ naanị iri afọ abụọ ka Solomọn gbara. 1Ih 22:5; Jer 1:6 3:7 Maọbụ, na-amaghị otu m ga-esi arụ ọrụ m ndị a. 3:16 Ka o dozieere ha okwu. 3:28 1Ez 3:9,11-12; 2Ih 1:12; Dan 1:17; Kọl 2:2,3

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.