Native Bible

1 Kings 21:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma nwunye ya bụ Jezebel, bịakwutere ya jụọ ya sị, “Gịnị mere i ji jụ iri ihe? Gịnị mere i ji nọgide nʼobi ọjọọ na iwe?”

1 Kings 21:5 in English

1 Kings 21:5 · Berean Standard Bible

Soon his wife Jezebel came in and asked, “Why are you so sullen that you refuse to eat?”

Context

3Ma Nebọt zara sị Ehab, “Ala a bụ ihe nketa ruuru m site nʼaka nna nna m ha. M ga-esi aṅaa nye gị ya. Onyenwe anyị ekwela na m ga-ewere ihe nketa nke nna nna m ha nye gị.” 4Ehab jiri obi ụfụ na ihu mgbarụ laa nʼụlọ ya nʼihi okwu a Nebọt, onye Jezril gwara ya, sị, “Agaghị m enye gị ihe nketa nna nna m ha.” O dinara nʼihe ndina ya, chee ihu ya nʼaja ụlọ, jụ iri ihe ọbụla. 5Ma nwunye ya bụ Jezebel, bịakwutere ya jụọ ya sị, “Gịnị mere i ji jụ iri ihe? Gịnị mere i ji nọgide nʼobi ọjọọ na iwe?” 6Ehab zara sị ya, “Agwara m Nebọt, nwoke onye Jezril okwu sị ya, ‘Resi m ubi vaịnị gị, ma ọ bụrụ na ị chọrọ, aga m enye gị ala ubi ọzọ mara mma nʼọnọdụ ya.’ Ma ọ jụrụ jụwaa isi inye m ubi ahụ.” 7Mgbe ahụ, nwunye ya Jezebel jụrụ ya ajụjụ sị ya, “Ọ bụghị gị bụ eze na-achị Izrel? Bilie, rie nri, enyela obi gị nsogbu, nʼihi na aga m enyefe gị ubi vaịnị Nebọt onye Jezril nʼaka.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.