1 Ndị Eze 21:6
1 Kings 21:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ehab zara sị ya, “Agwara m Nebọt, nwoke onye Jezril okwu sị ya, ‘Resi m ubi vaịnị gị, ma ọ bụrụ na ị chọrọ, aga m enye gị ala ubi ọzọ mara mma nʼọnọdụ ya.’ Ma ọ jụrụ jụwaa isi inye m ubi ahụ.”
1 Kings 21:6 in English
1 Kings 21:6 · Berean Standard Bible
Ahab answered, “Because I spoke to Naboth the Jezreelite and told him, ‘Give me your vineyard for silver, or if you wish, I will give you another vineyard in its place.’ And he replied, ‘I will not give you my vineyard!’”
Context
4Ehab jiri obi ụfụ na ihu mgbarụ laa nʼụlọ ya nʼihi okwu a Nebọt, onye Jezril gwara ya, sị, “Agaghị m enye gị ihe nketa nna nna m ha.” O dinara nʼihe ndina ya, chee ihu ya nʼaja ụlọ, jụ iri ihe ọbụla. 5Ma nwunye ya bụ Jezebel, bịakwutere ya jụọ ya sị, “Gịnị mere i ji jụ iri ihe? Gịnị mere i ji nọgide nʼobi ọjọọ na iwe?” 6Ehab zara sị ya, “Agwara m Nebọt, nwoke onye Jezril okwu sị ya, ‘Resi m ubi vaịnị gị, ma ọ bụrụ na ị chọrọ, aga m enye gị ala ubi ọzọ mara mma nʼọnọdụ ya.’ Ma ọ jụrụ jụwaa isi inye m ubi ahụ.” 7Mgbe ahụ, nwunye ya Jezebel jụrụ ya ajụjụ sị ya, “Ọ bụghị gị bụ eze na-achị Izrel? Bilie, rie nri, enyela obi gị nsogbu, nʼihi na aga m enyefe gị ubi vaịnị Nebọt onye Jezril nʼaka.” 8Ya mere, Jezebel dere akwụkwọ nʼaha Ehab, were mgbaaka akara eze kaa nʼakwụkwọ ndị ahụ, zigara ha ndị okenye obodo na ndị a na-asọpụrụ bi nʼobodo ebe Nebọt bi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.