1 Ndị Eze 21:27
1 Kings 21:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Ehab nụrụ okwu amụma ndị a, ọ dọwara uwe ya, yikwasị onwe ya akwa mkpe, buo ọnụ, dinaa nʼakwa mkpe ahụ, jegharịakwa nʼịdị umeala.
1 Kings 21:27 in English
1 Kings 21:27 · Berean Standard Bible
When Ahab heard these words, he tore his clothes, put on sackcloth, and fasted. He lay down in sackcloth and walked around meekly.
Context
25(Nʼezie, o nweghị onye ọbụla ọzọ dị ka Ehab, onye rere onwe ya nye ime ihe ọjọọ dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị, onye Jezebel nwunye ya kwagidere ime ihe ọjọọ dị iche iche. 26Ehab bụ onye mere mmehie dị oke njọ nke ịgbaso na ife arụsị dị iche iche ofufe dịka ndị Amọrait* mere, bụ ndị ahụ Onyenwe anyị sitere nʼala a chụpụ ime ka ndị Izrel nweta ala ha.) 27Mgbe Ehab nụrụ okwu amụma ndị a, ọ dọwara uwe ya, yikwasị onwe ya akwa mkpe, buo ọnụ, dinaa nʼakwa mkpe ahụ, jegharịakwa nʼịdị umeala. 28Ma okwu Onyenwe anyị rutere Ịlaịja, onye Tishbe ọzọ, sị ya, 29“Ị hụrụ otu Ehab si weda onwe ya ala nʼihu m? Nʼihi ihe a o mere, iweda onwe ya ala nʼihu m, agaghị m eme ka ihe ọjọọ ndị a m kwuru okwu banyere ha rute ya nʼoge ọ dị ndụ. Kama aga m eme ka ihe ndị a dakwasị ezinaụlọ ya mgbe nwa ya ga-achị dịka eze.”
21:1 Sameria bụ isi obodo alaeze ugwu ugwu, ya mere ọ na-anọchite anya alaeze ahụ nʼebe a. 1Ez 16:24
21:10 Ị kọchaa Chineke na eze Ọpụ 22:28; Lev 24:15-16; Ọrụ 6:11
21:26 Aha a, ka e ji mara ndị biri nʼala ahụ Chineke kwere Ebraham na nkwa tupu ụmụ Izrel a bịa bichie na ya. Jen 15:16; Ọpụ 23:23; Dit 1:7-8; 2Ez 21:11
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.