Native Bible

1 Kings 21:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

(Nʼezie, o nweghị onye ọbụla ọzọ dị ka Ehab, onye rere onwe ya nye ime ihe ọjọọ dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị, onye Jezebel nwunye ya kwagidere ime ihe ọjọọ dị iche iche.

1 Kings 21:25 in English

1 Kings 21:25 · Berean Standard Bible

(Surely there was never one like Ahab, who sold himself to do evil in the sight of the LORD, incited by his wife Jezebel.

Context

23“Ma banyere Jezebel, Onyenwe anyị sịrị, ‘Ụmụ nkịta ga-eri anụ ahụ Jezebel nʼakụkụ mgbidi aja ụlọ dị nʼobodo Jezril.’ 24“Nkịta ga-eri anụ onye ọbụla si nʼezinaụlọ Ehab nke nwụrụ nʼime obodo, ma anụ ufe nke eluigwe ga-eri anụ ndị ọbụla nwụrụ nʼọhịa.” 25(Nʼezie, o nweghị onye ọbụla ọzọ dị ka Ehab, onye rere onwe ya nye ime ihe ọjọọ dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị, onye Jezebel nwunye ya kwagidere ime ihe ọjọọ dị iche iche. 26Ehab bụ onye mere mmehie dị oke njọ nke ịgbaso na ife arụsị dị iche iche ofufe dịka ndị Amọrait* mere, bụ ndị ahụ Onyenwe anyị sitere nʼala a chụpụ ime ka ndị Izrel nweta ala ha.) 27Mgbe Ehab nụrụ okwu amụma ndị a, ọ dọwara uwe ya, yikwasị onwe ya akwa mkpe, buo ọnụ, dinaa nʼakwa mkpe ahụ, jegharịakwa nʼịdị umeala.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.