Native Bible

1 Kings 2:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, Solomọn chụpụrụ Abịata* ka ọ ghara ịbụ onye nchụaja Onyenwe anyị ọzọ. Otu a ka o si mezuo* bụ okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru banyere ezinaụlọ Elayị na Shaịlo.

1 Kings 2:27 in English

1 Kings 2:27 · Berean Standard Bible

So Solomon banished Abiathar from the priesthood of the LORD and thus fulfilled the word that the LORD had spoken at Shiloh against the house of Eli.

Context

25Eze Solomọn zigara Benaya nwa Jehoiada ka ọ gaa gbuo Adonaịja. Benaya gakwara tigbuo Adonaịja. 26Eze kpọkwara Abịata onye nchụaja sị ya, “Laghachi azụ nʼubi gị nʼAnatot.* I kwesiri ịnwụ ọnwụ ma ọ bụghị ugbu a ka a ga-egbu gị nʼihi na i buru igbe ọgbụgba ndụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị nʼoge nna m Devid dị ndụ. I sokwa ya hụọ ahụhụ nʼoge ahụ niile o nwere nsogbu.” 27Ya mere, Solomọn chụpụrụ Abịata* ka ọ ghara ịbụ onye nchụaja Onyenwe anyị ọzọ. Otu a ka o si mezuo* bụ okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru banyere ezinaụlọ Elayị na Shaịlo. 28Ma mgbe Joab nụrụ na Adonaịja anwụọla, ọ gbaara ọsọ gaa nʼụlọ nzute Onyenwe anyị jigide mpi dị nʼakụkụ ebe ịchụ aja aka. Ọ bụ ezie na Joab so Adonaịja gbaa izu imegide Solomọn, ma o soghị Absalọm gbaa izu imegide Devid. 29Mgbe a gwara eze Solomọn, na Joab a gbabala nʼụlọ ikwu Onyenwe anyị, nọdụ nʼakụkụ ebe ịchụ aja. Solomọn nyere Benaya, nwa Jehoiada iwu sị, “Gaa, tituo ya nʼala.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.